1. Onye kere gi?
Ọ bụ Chukwu kere m
2. Maka gịnị ka chukwu jiri kee gị?
Chukwu kere m ka m mara ya, kam fu ya n’anya, kam fee ya n’ uwa, kam were binyere ya n’ anụli ebeebe n’ uwa ozo
3. Onye ka iyiri ka chukwu kechara gi?
Chukwu kere m yie ya
4. ọbu n’ahu gị ka iyiri Chikwu ka ọbụ na mkpuruobi gị?
oyiyi m yiri Chukwu ka na mkpuruobi m.
5. Kedu ka mkpụrụobi gị siri yie Chukwu?
Mkpụrụobi m yiri chukwu maka na ọbụ mmụọ bia bụrụ anwụ anwụ
6.Kedụ isi ihe bụ na mkpụrụobi gi bụ anwụ anwụ?
Isi ihe bu na mkpụrụobi m bụ anwụ anwụ bu na mkpụrụobim ama nwụnata anwụ.
7. Ọ bụ ahụ gi ka ị ga akpachapụru anya ka ọbụ mkpụrụobi gi?
Agam akpachapụrụ mkpụrụobi m anya n’ihi na Ksriti kwuru sị : kedu uru ọ ga abara mmadụ ma ritechaa ụwa nile n’elele ma mkpụrụobi ya efunari ya
8. Gịni ka I ga eme were zoro mkpụrụobi gi?
Ihe m ga-eme weree zoro mkpụrụobi m bụ na aga m efe Chukwu site n’okwukwe, na nchekwube, na ihunanya, isi ya bu na agam ekwere na ya, chekube na ya, bịa were obi m nile fụ ya n’anya