Gịnị gụ okwukwe ?
Okwukwe bu onyinye mmụọ Chukwu ji eme ọgọ, nke n’enyere anyị aka ikwerenu, ghara itụ uche ọbụla n’ihe Chukwu egosila
Gịnị kpatara iga eji n’ekwere n’ihe ọbụla Chukwu gosiri?
Ihe kpatara m ga eji na-ekwere ihe ọbụla Chukwu gosiri bụ na Chukwu bụ eziokwu ahụ, o ma alafunata mmadu, nke mmadu na-alafunata ya.
Kedu ka Iga esi na-ama ihe Chukwu gosiri?
Ka m ga-esi na-ama ihe Chukwu gosiri bụ: site n’ama na nkuzi, na ike nke nzuko katọlik.
Kedu ebe eziokwu ahụ Chukwu gosiri nzuko ya dị?
Ha dị n’ime akwụkwọ nsọ, n’ime nkuzi ọdịbendị nke nzuko.
Gịnị bụ akwụkwọ nsọ?
Ọ bụ okwu nkwu Chukwu dị n’akwụkwọ nsọ e dere site na nkuzi nke mmụọ nsọ, ya ka akpọrọ Baịbụlụ
Agba ole ka enwere n; akwụkwọ nso ahụ?
O bụ agba abụọ ka ekere ya, agba ochie n’ agba ọhụrụ.
Gịnị bụ nkuzi ọdịbendị nke nzukọ?
Ọ bụ okwu nke Chukwu edeghi n’ime akwukwo nsọ, nke si n’aka fere aka were ruo anyị aka.
Ọ bụrụ anyi iwu ikwere ihe nkuzi ọdịbendị a kuziri anyị?
Ee, makana Mmụọ nsọ kwuaziri okwu site n’akwụkwọ odide ha, ya mere pọl onye apọsụrụ ji kwuo sị ‘Ya bụ, ụmụnna m, kwuasie nu ike wee jide nkuzi odibendi nkea akuziri ụnụ site n’okwu ọnụ anyị ma ọbụ site n’akwụkwọ anyị.’
Maara anyi atụ ihe ụfọdụ a kuzugara site n’odibendi nke nzuko?
ọmụmatụ ụfọdụ bụga: Baptizim ụmụaka, iwu ido ụbọchị sọnde asọ kama ụbọchị sabat
Onye nyere nzukọ katọlik ike nke mmụọ iji na-akụzi nkuzi?
Onye nzukọ katọlik ike nke mmụọ iji na-akụzi nkuzi bụ Jeso Kristi mgbe ọgwara ndị apọsụrụ sị ha: ‘Jebenu ka ụnụ kụzibere mba nile’.
OKWUKWE NDỊ APỌSỤRỤ
Kedu ihe bụ ihe Chukwu gosigara?
Ihe bụ ihe Chukwu gosigara dị na okwukwe ndị apọsụrụ
Gụa okwukwe ndị Azpọsụrụ
Ekwerem na Chukwu nna,
Onye pụrụ ime ihe nile,
Onye okike nke eluigwe n’ala,
Ekwerem na jeso Kristi,
Onye bụ sọ otu nwa Chineke,
Bịa bụrụ dinwenu anyị,
Vejin marịa tụụrụ ime ya site n’ike nke mmụọnsọ,
Ọ bịa mụọ ya,
O wee taa ahụhụ n’oge ọchịchị pọntus paịlet,
Akpọgbuo ya n’obe,
ọ nwụọ,
E lie ya,
O gbada na ala mmụọ,
O ruo n’ụbọchi nke atọ,
O si n’ọnwụ bilite,
Wee rogolu n’eluigwe,
Nọdụ n’aka nri Chukwu,
Nna ji ike nile,
Ebe ahụ ka ọ a-esi bịa,
Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe,
Ekwere m na mmụọ nsọ,
Ekwere m na Nzukọ nsọ katọlik dị asọ,
Ekwere m na mmekọ nke ndị nsọ,
Ekwere m na mgbaghara nke njọ,
Ekwere m na mbilite n’ọnwụ nke ahụ,
Ekwere m na ndụ ebebe
ụzọ ole ka ekere okwuwe ndị apọsụrụ?
E kere okwukwe ndị apọsụrụ ụzọ iri na abụọ
OKE NKE MBỤ NKE OKWUKWE
kedụ nke bụ oke nke mbụ nke okwukwe?
Oke nke mbụ nke okwukwe bụ: Ekwere m na Chukwu nna, onye pụrime ihe nile, onye okike nke eluigwe n’ala.
Onye bụ Chukwu?
Chukwu bụ mmụọ kachanụ, onye jiri aka ya dịrị n’onwe ya, onye n’enweghi isi mbido ka ọna enwe isi njedebe bịa bụrụazi onye okike, oseburuwa nke ihe nile,
Maka gịnị mere eji akpọ Chukwu onye pụrụ ime ihe nile?
Ihe eji akpọ Chukwu onye pụrụ ime nile bụ n’onweghi ihe nyịrị ya omume n’ebe Chukwu nọ.
Maka gịnị mere eji akpọ Chukwu onye kere eluigwe n’ala?
Ihe eji akpọ Chukwu onye kere eluigwe n’ala bụ maka na okere eluigwe n’ala na ihe nile n’ejighi ihe ke site n’ike okwu ọnụ ya.
Chukwu onwere isi mbido ka?
Mba Chukwu enweghi isi mbido, ọ dịrịị adị, ọdị ugbua, ọ ga na-adịrịrị
Ebee ka Chukwu nọ?
Chukwu nọ ebe nile
Chukwu ọmazu ihe nile bịa na ahuzu ihe nile ka?
Ee, Chukwu mazuru ihe nile bịa na-ahụzu ihe nile ma echiche anyị bu n’uche.
Chukwu onwere ahụ ka?
Mba, Chukwu enweghi ahụ n’ihi na ọbụ mmụọ.
Gịnị bụ mmụọ?
Mmụọ bụ onye dị adị dị ndụ, n’enweghi ahụ, adịghị ahụ ya anya ma ọbụ nụ olu ya ma ọbụ metụ ya aka.
Ụdị mmụọ ole dị?
Ha dị udị abụọ: mmụọ ekeghi eke, ya bụ Chukwu n’onwe ya, na mmụọ ekereke ha bụ ndị angel na ekwensu na mkpụrụobi anyi ga.
O bụ sọ otu Chukwu dị ka?
Ee, ọbụ sọ otu Chukwu di.
Ha dị pesịn atọ na chukwu ka?
Ee, ha dị pesịn atọ na Chukwu: Chukwu nna, Chukwu nwa na Chukwu mmụọ nsọ.
‘Pesịn’ atọ a bụdụ Chukwu atọ ka?
Mba pesịn atọ a bụghịkwa Chukwu atọ: Nna na nwa na mmụọ nsọ bụ otu Chukwu na ibe ya ahụ.
Pesịn atọ a ha hazu nhanya na mma?
Ee, ha hazuru nhanya na mma: ka nke si dị, ka ibe ya si dị, maka ha atọ bụ otu na ibe ya ahụ.
Gịnị ka ana-akpọ ihe omimi nke ‘pesịn’ ato n’ime otu Chukwu.
Ihe ana-akpọ ihe omimi nke pesịn atọ n’ime otu Chukwu bụ: ‘Atọ n’ime otu dị ngọzi.
Ọ gịnị bụ ihe omimi?
Ihe omimi bụ eziokwu ọbụla Chukwu ji aka ya wepụta ma ya akarịa uche mmadụ nghọta.
Onwere ka mkpụrụobi gi siri yie atọ n’ime otu dị ngọzi?
Ee, ka mkpụrụobi m siri yie atọ n’ime out dị ngọzi bụ na etu ha siri dị pesịn atọ n’otu Chukwu, ka ha siri dị ike atọ n’ottu mkpụrụobi m.
Kedugadu ike atọ ahụ dị na mkpụrụobi gị?
Ike atọ dị na mkpụrụobi m bụga: ncheta, nghọta na uche.